Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 3 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Maachị 2027

Wenezdee · Izu nke 3 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 3 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dit 4:1, 5–9

1Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu. 5Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta. 6Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.” 7Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere? 8Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa? 9Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 147:12–13, 15–16, 19

12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị. 13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. 15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa. 16Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ. 19O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.

Oziọma

Mat 5:17–19

17“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. 18Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. 19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike