Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 4 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 19 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Maachị 2027
Tọọzdee · Izu ịhapụ anụ · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke Izu ịhapụ anụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
20Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. 21Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.” 5:1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya. 2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. 3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. 4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. 5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke? 6Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu. 7Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe: 8Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara. 9Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 10Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 11Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. 12Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ. 13Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. 14Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị. 15Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya. 16Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ. 17Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ. 18Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka. 19Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ. 20Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. 21Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.
Oziọma
1Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet. 2Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe. 4Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.” 5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya. 6Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ. 7Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ. 8Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha. 9Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?” 10Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya. 11Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas. 12Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?” 13Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!” 14Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!” 15Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 4 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike