Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 25 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 12 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Febrụwarị 2027
Tọọzdee · Izu nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Iveron Icon of the Mother of God (9th C)
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị. 9Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile. 10Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị. 2:1Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ. 2Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile. 3Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile. 4Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya. 5Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya. 6Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya.
Oziọma
31Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide. 32“Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya. 33Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya! 34Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche. 35“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. 36Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. 37Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ” 14:1Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya. 2Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 25 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike