Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 24 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Febrụwarị 2027
Wenezdee · Izu nke 2 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 2 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
18Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.” 19Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m. 20O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.
Abụ Ọma nzaghachi
4Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike. 5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu. 13Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m. 14Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” 15Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
Oziọma
17Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha, 18“Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, 19nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.” 20Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha. 21Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.” 22Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?” Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.” 23Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.” 24Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a. 25Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 26Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi. 27Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile. 28Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike