Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 19 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Febrụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 1 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 1 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Obubu ọnụ na nchegharị
Izere anụ
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
21“Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 22Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere. 23Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ? 24“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ. 25“Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? 26Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ. 27Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya. 28Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.
Oziọma
20Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị. 21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ 22Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. 23“Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo, 24hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị. 25“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 26Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike