Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 20 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Febrụwarị 2027

Satọdee · Izu nke 1 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 1 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dit 26:16–19

16Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha. 17I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee. 18Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu. 19O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke unu, dịka o kwere na nkwa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 119:1–2, 4–5, 7–8

1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị. 2Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. 4I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. 5Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! 7Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. 8Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.

Oziọma

Mat 5:43–48

43“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’ 44Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. 45Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. 46Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. 47Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. 48Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike