Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 18 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Febrụwarị 2027
Tọọzdee · Izu nke 1 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 1 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. 2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile. 3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. 7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m. 8Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m; ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
Oziọma
7“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 8Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. 9“Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? 10Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? 11Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya! 12Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike