Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 19 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 6 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Febrụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 38 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Meeting of the Lord
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị. 3O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya. 4O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute. 5Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma, 6tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi. 7Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna. 8Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga. 10Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
Oziọma
1Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.” 2Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.” 3Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, 4“Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?” 5Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu. 6Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 7Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị. 8Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 19 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike