Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 17 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Febrụwarị 2027

Wenezdee · Izu nke 1 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 1 nke Lent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Ndị nsọ asaa tọrọ ntọala Ọgbakọ Servite · Ncheta nkenke

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jona 3:1–10

1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị, 2“Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.” 3Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu. 4Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.” 5Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe. 6Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ. 7Nke a bụ nkwusa ya nʼime Ninive: Nke a bụ iwu sitere nʼaka eze na ndị a maara aha ha: “Ka mmadụ ọbụla, maọbụ anụmanụ, igwe ehi maọbụ anụ ụlọ ọbụla, ghara idetu ihe ọbụla nʼọnụ, ka ha ghara iri ihe maọbụ ṅụọ mmiri. 8Kama ka onye ọbụla yiri akwa mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusikwaa Chineke ike, ka ha sikwa nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa, sikwa nʼọrụ ọjọọ ha na ime ihe ike ha niile chegharịa. 9Onye maara? Ma eleghị anya, Chineke ga-ejide oke iwe ya, ma site nʼọmịiko ya wezuga iwe ọkụ ya si otu a mee ka anyị ghara ịla nʼiyi.” 10Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 51:1–2, 10–11, 16–17

1Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.

Oziọma

Luk 11:29–32

29Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona. 30Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a. 31Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a. 32Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike