Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 15 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Febrụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 1 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 1 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Lev 19:1–2, 11–18

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ. 11“ ‘Unu ezula ohi. “ ‘Unu aghala ụgha. “ ‘Unu aghọgbula ibe unu. 12“ ‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị. 13“ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya. 14“ ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị. 15“ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ. 16“ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị. 17“ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya. 18“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 19:7–9, 14

7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 14Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.

Oziọma

Mat 25:31–46

31“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. 32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. 33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya. 34“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. 35Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. 36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ 37“Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? 38Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? 39Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ 40“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’ 41“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. 42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. 43Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ 44“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ 45“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ 46“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike