Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 13 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Febrụwarị 2027

Satọdee · Lent: ụbọchị ndị na-eso Wenezdee Ntụ

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee mgbe Wenezdee Ntụ gasịrị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 58:9–14

9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. 11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata. 12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi. 13“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ, sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m, ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu, ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị, na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ, 14mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị, m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ, meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 86:1–6

1Ekpere Devid. Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa. 2Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m; 3meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile. 4Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m. 5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. 6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.

Oziọma

Luk 5:27–32

27Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.” 28Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya. 29Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?” 31Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. 32Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike