Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 12 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Febrụwarị 2027

Fraịdee · Lent: ụbọchị ndị na-eso Wenezdee Ntụ

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee mgbe Wenezdee Ntụ gasịrị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Obubu ọnụ na nchegharị

Izere anụ

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 58:1–9

1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha. 2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso. 3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara. 4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu. 5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara, naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala? Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara, nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ? Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ, ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara? 6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla? 7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. 8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. 9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 51:1–4, 16–17

1Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 3Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.

Oziọma

Mat 9:14–15

14Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?” 15Jisọs jụrụ ha sị, “O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike