Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 11 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 29 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Febrụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 37 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Translation of the relics of the Hieromartyr Ignatius the God-bearer, Bishop of Antioch († 107)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jem 4:7–5:9

7Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ. 8Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ. 9Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ. 10Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu. 11Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe. 12Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe? 13Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.” 14Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. 15Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.” 16Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ. 17Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie. 5:1Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. 2Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu. 3Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a. 4Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 5Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya. 6Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu. 7Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. 8Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 9Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ.

Akwụkwọ ozi (maka Fraịdee)

1Pt 1:1–2, 10–12; 2:6–10

1Pita, onyeozi Jisọs Kraịst, Na-edegara unu ndị niile ndị a họpụtara, ndị gbara ọsọ ndụ gaa biri na Pọntọs, na Galeshịa, na Kapadosia, Eshịa na Bitinia, akwụkwọ a. 2Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba. 10Banyere nzọpụta a, ndị amụma ahụ kwuru ihe banyere amara ahụ gaje ịbịara unu jiri nnọọ nwayọọ nyochasịa 11ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya. 12E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a. 2:6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.” 7Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ, “Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.” 8Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.” Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha. 9Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube. 10Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka.

Oziọma

Mak 11:27–33

27Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya. 28Ha sịrị ya, “Olee ikike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ikike ime ha?” 29Jisọs sịrị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ, unu zaa m ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a. 30Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.” 31Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 32Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼaka mmadụ.’ ” (Ha na-atụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma nʼezie.) 33Ya mere ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị.” Jisọs zaghachikwara ha sị, “Agakwaghị m agwa unu ụdị ikike m ji na-eme ihe ndị a.”

Oziọma (maka Fraịdee)

Mak 12:1–12

1Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ. 2Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ. 3Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 4Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere. 5O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe. 6“O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya. 7“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 8Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ. 9“Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ. 10Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. 11Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’?” 12Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 11 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike