Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 11 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Febrụwarị 2027
Tọọzdee · Lent: ụbọchị ndị na-eso Wenezdee Ntụ
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee mgbe Wenezdee Ntụ gasịrị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Nne anyị nke Lourdes · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. 16Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta. 17Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, 18agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta. 19Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ 20ka ị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.
Abụ Ọma nzaghachi
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Oziọma
22na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.” 23Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m. 24Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya. 25Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya?
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike