Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 10 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 28 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Febrụwarị 2027

Wenezdee · Izu nke 37 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Ephraim the Syrian († c. 373-379)

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jem 3:11–4:6

11Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta? 12Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ. 13Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala. 14Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu. 15Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ. 16Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị. 17Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya. 18Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume. 4:1Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu? 2Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere. 3Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa. 4Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke. 5Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.” 6Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”

Oziọma

Mak 11:23–26

23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. 24Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu. 25Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu. 26Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 10 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike