Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 8 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 26 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Febrụwarị 2027
Mọnde · Izu nke 37 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Xenophon with his wife Mary, and their sons Arcadius and John of Constantinople (5th-6th C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
14Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya? 15Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, 16ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? 17Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya. 18Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ 19I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja. 20Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya? 21Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja? 22Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke. 23Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke. 24Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe. 25Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche? 26Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.
Oziọma
46Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. 47Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!” 48Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 49Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.” 50Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs. 51Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.” 52Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 8 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike