Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 9 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Febrụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 5 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 5 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 1:20–2:4

20Chineke kwuru sị, “Ka mmiri jupụta nʼihe ndị na-eku ume, ka ụmụ anụ ufe fegharịkwa nʼelu ụwa, ma nʼelu mbara igwe.” 21Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 22Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.” 23Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise. 24Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị. 25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.” 27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha. 28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.” 29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị. 30Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.” 31Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii. 2:1Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha. 2Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile. 3Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile. 4Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị Chineke kere eluigwe na ụwa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 8:3–8

3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha, 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha? 5I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 8na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

Oziọma

Mak 7:1–13

1Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu, 2ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri. 3Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye. 4Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ. 5Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?” 6Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 7Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ 8Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.” 9Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya. 10Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’ 11Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke). 12Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka. 13Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike