Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 1 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Febrụwarị 2027
Mọnde · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 4 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
32Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, na Barak, na Samsin, na Jefta, na Devid, na Samuel na ndị amụma, 33ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm. 34Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ. 35Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma. 36E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ. 37A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ. 38Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu. 39A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. 40Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
19Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ. 20I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. 21Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. 22Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. 23Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.
Oziọma
1Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin. 2Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. 3Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. 4Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. 5Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ. 6Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. 7O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” 8Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!” 9Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” 10Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ. 11Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. 12Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.” 13Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile. 14Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. 15Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha. 16Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ. 17Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha. 18Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha. 19Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.” 20Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike