Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 2 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Febrụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Nchụ Onyenwe anyị nʼụlọnsọ

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mal 3:1–4

ma ọ bụ: Hib 2:14–18

1“Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 2“Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa. 3Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume. 4Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye Onyenwe anyị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 24:7–10

7Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata. 8Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha. 9Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa. 10Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela

Oziọma

Luk 2:22–40

22Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị 23(dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”), 24ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.” 25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị, 29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. 30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, 31nke i kwadoro nʼihu mba niile. 32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.” 33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.” 36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa. 37Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere. 38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem. 39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili. 40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike