Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 1 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 19 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Febrụwarị 2027
Mọnde · Izu nke 36 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Macarius the Great, of Egypt († c. 390-391)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
17Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja, 18ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 19Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya. 20Ọ bụ okwukwe ka Aịzik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzị banyere ihe dị nʼihu. 21Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya. 22Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya. 23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere. 27Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya. 28O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka. 29Ha gafere Osimiri Uhie site nʼokwukwe dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma mgbe ndị Ijipt nwara ime nke a, mmiri lomiri ha niile. 30Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa. 31Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.
Akwụkwọ ozi (maka Tiuzdee)
25Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị. 26Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.” 13:22Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo. 23Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya. 24Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha. 25Ka amara dịnyere unu niile.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Makariọs Onye Ukwu)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma
42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. 43Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; 44ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 45Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; 46ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 47Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, 48ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 49A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu. 50“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.” 10:1Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe.
Oziọma (maka Tiuzdee)
2Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” 3Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” 4Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” 5Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a. 6Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ 7‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. 8Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. 9Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 10Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. 11Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. 12Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 1 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike