Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 31 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Jenụwarị 2027
Sọnde · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 4 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị. 16Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.” 17Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma. 18Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha. 19Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike. 20Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. 2Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. 6Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 7nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, 8“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
32Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ. 33Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ. 34Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ. 35Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.
Oziọma
21Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe. 22Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu. 23Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, 24sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” 25Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!” 26Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta. 27Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.” 28Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn Bosko, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike