Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 27 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Jenụwarị 2027
Wenezdee · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Anjela Merici, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
11Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie. 12Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke. 13Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 14Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile. 15Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo: 16“Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.” 17O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.” 18Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” 2Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. 3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”
Oziọma
1Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ. 2O bidoro i kuziri ha ọtụtụ ihe nʼilu, ma nʼozizi ya, ọ sịrị ha, 3“Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya. 4Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha. 5Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi. 6Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. 7Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ. 8Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.” 9Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” 10Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ. 11Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu, 12nke mere na, “ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla, ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’ ” 13Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ? 14Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke. 15Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha. 16Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ. 17Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. 18Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ; 19ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. 20Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Anjela Merici, Nwaagbọghọ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike