Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 28 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Jenụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 3 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Tọmọs Akwinas, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 10:19–25

19Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs, 20bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya, 21ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke, 22ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị. 23Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi. 24Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. 25Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 24:1–6

1Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 2Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike. 3Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya? 4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. 5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. 6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela

Oziọma

Mak 4:21–25

21Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ? 22Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee. 23Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” 24Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa. 25Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike