Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 27 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 14 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Jenụwarị 2027

Wenezdee · Izu nke 35 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Apodosis of the Theophany

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 10:1–18

1Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke. 2Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha. 3Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile. 4Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie. 5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m. 6Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. 7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ” 8O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. 10Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro. 11Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie. 12Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke. 13Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 14Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile. 15Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo: 16“Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.” 17O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.” 18Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.

Oziọma

Mak 8:30–34

30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya. 31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị. 32Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba. 33Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.” 34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 27 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike