Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 26 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Jenụwarị 2027
Tiuzdee · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Ndị nsọ Timoti na Taịtọs, Ndị bishọp · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
ma ọ bụ: Taị 1:1–5
1Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị, 2Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. 3Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị. 4Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke. 5Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị. 6Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi. 7Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke. 8Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Eji m ndidi chere Onyenwe anyị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. 3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m. 10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
Oziọma
31Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya. 32Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.” 33Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?” 34Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, “Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke! 35Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Timoti na Taịtọs, Ndị bishọp
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike