Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 9 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 27 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Jenụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 32 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee mgbe Ọmụmụ Kraịst gasịrị
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Satọdee mgbe Ọmụmụ Kraịst gasịrị)
11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ. 12Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe. 13Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu 14ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe. 15Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. 16Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
Akwụkwọ ozi
14Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ. 15Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ. 16Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. 17Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. 18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. 19Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ. 20Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya. 21Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. 22Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile. 23Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Stivin)
8Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. 9Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka. 10Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu. 11Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.” 12Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe. 13Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị. 14Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.” 15Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi. 7:1Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?” 2Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran. 3Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’ 4“Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a. 5O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa. 47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ. 48“Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru, 49“ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru. 50Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’ 51“Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere. 52Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya. 53Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.” 54Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ. 55Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. 56Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.” 57Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya, 58dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl. 59Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.” 60O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.
Oziọma (maka Satọdee mgbe Ọmụmụ Kraịst gasịrị)
15Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile. 16Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ. 17Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru, 18“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 19Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi. 20Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. 21Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
Oziọma
10“Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. 11Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe? 12Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu? 13“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.” 14Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị. 15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.
Oziọma (maka Onye nsọ Stivin)
33“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. 35“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ 38“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. 40“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” 41Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” 42Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Disemba na kalenda nzukọ bụ 9 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike