Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 10 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 28 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Jenụwarị 2027
Sọnde · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 32 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde mgbe Ọmụmụ Kraịst gasịrị
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 10
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. 2Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. 3Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla. 4Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs. 5Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.” 6Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya. 7Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. 8Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. 9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha. 10Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” 11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya. 12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị. 13Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. 14Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
Akwụkwọ ozi (maka Sọnde mgbe Ọmụmụ Kraịst gasịrị)
11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. 12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. 13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. 14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. 15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, 16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. 17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. 18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. 19Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
Oziọma (maka Sọnde mgbe Ọmụmụ Kraịst gasịrị na maka Nne Chineke)
13Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.” 14Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt. 15Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.” 16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị. 17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, 18“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.” 19Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt 20sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.” 21Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel. 22Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili. 23Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Disemba na kalenda nzukọ bụ 10 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike