Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 9 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Jenụwarị 2027

Satọdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee mgbe Ngosipụta Onyenwe anyị gasịrị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Jọn 4:11–18

11Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. 12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. 13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. 14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. 15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. 16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. 17Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a. 18Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 72:1–2, 10–13

1Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 10Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba, ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye. 11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi. 12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.

Oziọma

Mak 6:45–52

45Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ. 46Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere. 47Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala. 48Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha. 49Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa. 50Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.” 51Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu. 52Obi ha mechiri emechi nʼihi na ha aghọtaghị ihe banyere ọrụ ebube ogbe achịcha ndị ahụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike