Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 10 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Jenụwarị 2027

Sọnde · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Baptizim nke Onyenwe anyị

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 55:1–11

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Aịz 12:2–6

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Jọn 5:1–9

1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya. 2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. 3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. 4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. 5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke? 6Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu. 7Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe: 8Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara. 9Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.

Oziọma

Mak 1:7–11

7O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. 8Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” 9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike