Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 8 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Jenụwarị 2027
Fraịdee · Oge Krismas
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee mgbe Ngosipụta Onyenwe anyị gasịrị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
7Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke. 8Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya. 9E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. 10Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume. 4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa
Oziọma
34Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe. 35Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala. 36Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.” 37Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?” 38Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.” 39Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. 40Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ. 41Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. 42Ha niile riri rijuo afọ. 43Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ. 44Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike