Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 7 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Jenụwarị 2027

Tọọzdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee mgbe Ngosipụta Onyenwe anyị gasịrị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Raymond nke Penyafort, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Jọn 3:22–4:6

22na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị. 4:1Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. 2Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. 3Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. 4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. 5Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. 6Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 2:7–8, 10–11

7Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị. 8Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị. 10Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa. 11Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

Oziọma

Mat 4:12–17, 23–25

12Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili. 13Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị. 14Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị, 15“Ala Zebụlọn na ala Naftalị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ, 16ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.” 17Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” 23Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ. 24Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile. 25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike