Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 6 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 24 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Jenụwarị 2027
Wenezdee · Izu nke 32 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Ụbọchị tupu Ọmụmụ Kraịst
Obubu ọnụ Ọmụmụ · Obubu ọnụ siri ike
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 1: Amụma
2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” 3Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel. 4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
Elekere nke 1: Akwụkwọ ozi
1Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. 2Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. 3Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. 4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha. 5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.” 7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.” 8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. 9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.” 10Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe. 12Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Elekere nke 1: Oziọma
18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”). 24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
Elekere nke 3: Amụma
Ọ dịghị na nsụgharị a
Elekere nke 3: Akwụkwọ ozi
23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ. 26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. 27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst. 28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. 29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
Elekere nke 3: Oziọma
1Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum. 2(Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) 3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ. 4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha. 6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. 7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije. 8Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. 9Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. 10Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. 11Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị. 12Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.” 13Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị, 14“Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe. Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.” 15Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.” 16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri. 17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a. 18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya. 19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya. 20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
Elekere nke 6: Amụma
10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” 12Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.” 13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? 14Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. 15Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe. 16Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha. 8:1Onyenwe anyị siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz. 2Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.” 3Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz. 4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.” 9Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu. 10Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
Elekere nke 6: Akwụkwọ ozi
10Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe. 12Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.” 13O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”? 14Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta? 2:1Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị. 2Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya. 3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
Elekere nke 6: Oziọma
1Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.” 3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. 5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” 7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.” 9Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá. 12Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.
Elekere nke 9: Amụma
6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
Elekere nke 9: Akwụkwọ ozi
11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.” 13Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.” 14Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. 16Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. 17Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. 18Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
Elekere nke 9: Oziọma
13Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.” 14Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt. 15Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.” 16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị. 17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, 18“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.” 19Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt 20sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.” 21Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel. 22Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili. 23Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe. 5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel! 6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha. 9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.” 17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. 18A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “aga m achịkọta ndị ngwụrọ, chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ, na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ. 7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ, meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike. Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. 5:2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” 3Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel. 4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ. 2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị. 3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. 4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ. 5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya. 6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha. 7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi. 8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
31“Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu. 32E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ isi mmadụ ahụ, jiri ọlaọcha kpụọ aka ya na obi ya. E jikwa bronz kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya. 33Ọ bụkwa igwe ka e ji kpụọ ogwe ụkwụ ya abụọ. Ma akụkụ ụkwụ ya, nke a na-azọ nʼala ka e ji igwe a gwara ya na ụrọ kpụọ. 34Mgbe ị na-ele anya, a wapụtara nkume, ma ọ bụghị aka mmadụ ka e ji wapụta ya. Nkume a kụrụ mmadụ ahụ a kpụrụ akpụ nʼukwu nkume na ụrọ ya, kụpịasịa ha. 35Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile. 36“Eze, nke a bụ nrọ ahụ. Ugbu a ka anyị kọwaara gị ihe nrọ ahụ pụtara. 44“Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi. 45Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” 12Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.” 13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? 14Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. 15Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe. 16Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha. 8:1Onyenwe anyị siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz. 2Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.” 3Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz. 4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.” 9Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu. 10Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
Akwụkwọ ozi (maka ụbọchị tupu Ọmụmụ Kraịst)
1Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. 2Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. 3Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. 4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha. 5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.” 7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.” 8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. 9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.” 10Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe. 12Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Oziọma (maka ụbọchị tupu Ọmụmụ Kraịst)
1Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum. 2(Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) 3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ. 4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha. 6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. 7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije. 8Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. 9Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. 10Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. 11Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị. 12Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.” 13Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị, 14“Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe. Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.” 15Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.” 16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri. 17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a. 18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya. 19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya. 20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Disemba na kalenda nzukọ bụ 6 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike