Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 2 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Jenụwarị 2027

Satọdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

2 Jenụwarị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Ndị nsọ Basil Onye Ukwu na Gregori nke Nazianzọs, Ndị bishọp na Ndị nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Jọn 2:22–28

22Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya. 23Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ. 24Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ. 25Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi. 26Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu. 27Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya. 28Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1–4

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

Oziọma

Jọn 1:19–28

19Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ? 20O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.” 21Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.” 22Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?” 23Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’ ” 24Ma ndị Farisii ahụ ezitere 25jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?” 26Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị. 27Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.” 28Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike