Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 1 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 19 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Jenụwarị 2027

Fraịdee · Izu nke 31 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Boniface at Tarsus in Cilicia and the Righteous Aglae (Aglaida) of Rome († 290)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jem 2:1–13

1Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” 4ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? 5Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? 6Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? 7Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? 8Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. 9Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. 10Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. 11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. 12Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. 13Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.

Oziọma

Mak 9:33–41

33Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?” 34Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya. 35Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.” 36Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, 37“Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.” 38Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.” 39Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. 40Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị. 41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Disemba na kalenda nzukọ bụ 1 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike