Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 1 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Jenụwarị 2027

Fraịdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Meri, Nne Chineke Nsọ

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọnụ 6:22–27

22Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 23“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha, 24“ ‘ “ Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu, 25Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara, 26Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.” ’ 27“Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 67:1–2, 4–5, 7

1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela 2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela 5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. 7Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Gal 4:4–7

4Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, 5ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara. 6Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.” 7Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke.

Oziọma

Luk 2:16–21

16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri. 17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a. 18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya. 19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya. 20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha. 21Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike