Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 20 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Disemba 2026
Sọnde · Izu nke 4 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 4 nke Advent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike, 2ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.” 3Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere gị.” 4Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị, 5“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi? 8“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel. 9Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. 10Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, 11dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “ ‘ Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ. 12Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. 14Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ. 15Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị. 16Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. 2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela 26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 28Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
25Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. 26Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. 27Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.
Oziọma
26Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.” 29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” 34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” 35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” 38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike