Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 21 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Disemba 2026
Mọnde · Izu nke 4 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
21 Disemba
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Pita Kanisiọs, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
ma ọ bụ: Zef 3:14–17
8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! Lee ya ka ọ na-abịa, na-amali elu nʼelu ugwu niile, na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile. 9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, ọ na-esikwa na oghereikuku na nʼoghere dị ya na-elebata anya. 10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m. 11Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 14Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.
Abụ Ọma nzaghachi
2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. 11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile. 12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
Oziọma
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pita Kanisiọs, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike