Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 19 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Disemba 2026

Satọdee · Izu nke 3 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

19 Disemba

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Nkp 13:2–7, 24–25

2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. 3Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. 4Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ. 5Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.” 6Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya. 7Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ” 24Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite. 25Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 71:3–6, 16–17

3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike. 4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m. 5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị. 6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị. 16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.

Oziọma

Luk 1:5–25

5Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn. 6Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla. 7Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi. 8O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke. 9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. 10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere. 11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya. 12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu. 13Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn. 14Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya. 15Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ. 16Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha. 17Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.” 18Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.” 19Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a. 20Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” 21Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ. 22Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu. 23Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya. 24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike