Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 20 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 7 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Disemba 2026
Sọnde · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 29 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 7
1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
Akwụkwọ ozi
12Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. 13Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu. 14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu. 15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele. 16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
Oziọma
12Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. 13Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” 14Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. 15Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. 16Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. 17Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? 18Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” 19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Disemba na kalenda nzukọ bụ 20 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike