Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 18 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Disemba 2026
Fraịdee · Izu nke 3 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
18 Disemba
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị. 7“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’ 8ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ. 18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. 19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya. Amen na Amen.
Oziọma
18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”). 24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike