Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 28 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Novemba 2026
Satọdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta, 2nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile. 3A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. 4Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha. 5Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 6Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya. 7“Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. 2Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. 3Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu. 4Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya. 5Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile. 6Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 7nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
Oziọma
34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. 35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. 36Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike