Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 27 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Novemba 2026
Fraịdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. 2O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ. 3Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge. 4Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ. 11Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. 12Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị. 13Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. 14Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. 15Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ. 21:1Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. 2Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.
Abụ Ọma nzaghachi
2Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ. 3Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. 4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela 5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. 7Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.
Oziọma
29Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. 30Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. 31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. 32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike