Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 19 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Novemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mkp 5:1–10

1Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ. 2Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?” 3Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa. 4Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya. 5Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.” 6Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile. 7Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ. 8Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ. 9Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile. 10Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 149:1–6, 9

1Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. 3Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha, 9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 19:41–44

41Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya, 42sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị. 43Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị. 44Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike