Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 18 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Novemba 2026
Wenezdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Nraranye Basilika nke Ndị nsọ Pita na Pọl, Ndị ozi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.” 2Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya. 3Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu. 4Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. 5Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke. 6Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ. 7Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe. 8Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’ bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.” 9Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, 10iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, 11“Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. 2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. 3Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, 4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, 5werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. 6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.
Oziọma
11Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe. 12Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. 13Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ 14“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ 15“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. 16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ 17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ 18“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ 19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ 20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. 21Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ 22“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? 23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ 24“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ 25“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ 26“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. 27Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ” 28Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike