Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 19 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 6 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Novemba 2026
Tọọzdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Saint Paul the Confessor, Bishop of Constantinople († 350)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ. 14Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 15Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu. 16Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, 17gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma. 3:1Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu. 2Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe. 3Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ. 4Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu. 5Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.
Oziọma
47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu. 48Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha. 49Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu. 50Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa, 51site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a. 52“Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.” 53Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, 54na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya. 12:1Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Novemba na kalenda nzukọ bụ 19 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike