Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 18 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 5 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Novemba 2026
Wenezdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Galaction and his wife Epistimia, at Emesa (3rd C)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. 2Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. 3Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. 4Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke. 5Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya? 6Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru. 7Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya. 8Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya. 9Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha. 10Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta. 11Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a. 12Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.
Oziọma
42“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọ na mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya. 43“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya. 44“Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe, nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.” 45Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.” 46Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Novemba na kalenda nzukọ bụ 18 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike