Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 17 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Novemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Elizabet nke Họngari, Onye okpukpe · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya: Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa. Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ. 2Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m. 3Ya mere, cheta ihe ndị ahụ ị natara na nke ị nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma ọ bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, ị gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị. 4Otu ọ dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi. 5Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile. 6Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile. 14“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya: Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere. 15Amaara m ọrụ gị niile, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ gaara adị nnọọ mma ma asị na ị na-ajụ oyi ma ọ bụkwanụ na-ekpo ọkụ. 16Nʼihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe ị dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị. 17Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. 18Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma. 19Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa. 20Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe. 21Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. Ọ bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya. 22Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”
Abụ Ọma nzaghachi
2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya. 3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya, 4onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya, 5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.
Oziọma
1Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. 2Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. 3Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. 4Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ. 5Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.” 6Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya. 7Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.” 8Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.” 9Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. 10Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Elizabet nke Họngari, Onye okpukpe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike