Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 15 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Novemba 2026

Sọnde · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 33 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ilu 31:10–13, 19–20, 30–31

10Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi. 11Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya. 12Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya. 13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ. 19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike. 20Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka. 30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito. 31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 128:1–5

1Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. 4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Te 5:1–6

1Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ. 2Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. 3Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ. 4Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi. 5Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị. 6Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị.

Oziọma

Mat 25:14–30

14“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. 15O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. 16Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. 17Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. 18Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. 19“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. 20Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ 21“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 22“Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ 23“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 24“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. 25Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ 26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. 27Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. 28“ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. 29Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. 30Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike