Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 16 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Novemba 2026
Mọnde · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Gertrude Onye Ukwu, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Magaret nke Skọtland · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn, 2onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst. 3Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso. 4Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya, 2:1“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ. 2Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha. 3I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị. 4Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere. 5Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Oziọma
35O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. 36Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme. 37Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.” 38O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!” 39Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 40Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya, 41“Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.” 42Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.” 43Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Gertrude Onye Ukwu, Nwaagbọghọ
- Onye nsọ Magaret nke Skọtland
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike