Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 15 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 2 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Novemba 2026

Sọnde · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 2

Mak 16:1–8

1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.

Akwụkwọ ozi

Efe 2:14–22

14Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị. 15Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị. 16Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ. 17Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso, 18Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ. 19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.

Oziọma

Luk 8:26–39

26Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin, nke dị nʼofe mmiri Galili. 27Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu. 28Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.” 29Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara. 30Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. 31Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis. 32Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike. 33Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha. 34Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere. 35Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe ọ nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha. 36Ndị hụrụ ka ihe a si mee kọọrọ ha ka e siri gwọọ onye ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. 37Mgbe ahụ, ndị niile bi na Gerazin na nʼobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nʼihi na egwu dị ukwuu tụrụ ha. Ọ banyekwara nʼime ụgbọ mmiri ahụ laghachi. 38Nwoke a e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ rịọrọ ya ka o soro ya ma o zilagara ya, sị ya, 39“Laghachi nʼezinaụlọ gị kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị.” Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nʼobodo ahụ niile.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Novemba na kalenda nzukọ bụ 15 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike